|
IgboNet |
|
The Igbo Network |
|
|
|
|
|
|
||||||
|
|
||||||||
|
|
THE 2001 AHỊAJỌKỤ LECTURE IGBO OR IGBOID: ASỤSỤ N’AGBỤRỤ NDỊ
IGBO LANGUAGE IN IGBO CIVILIZATION by Prof. Emmanuel Nwanolue Emenanjo B.A. (Hons.) English, M.A. (Linguistics) EKELE Igbo
mma mma nụ Ekelee
m Abịa
mma mma nụ Ekelee
m Anambara Mmma
mma nụ Ekelee
m Delta
mma mma nụ Ekelee
m Ebonyi
mma mma nụ Ekelee
m Enuugwu
mma mma nụ Ekelee
m Imo
mma mma nụ Ekelee
m Rivas
mma mma nụ Ekelee
m Naịjirịa
mma mma nụ Ekelee
m Igbo
bụ Igbo mma mma nụ Ekelee
m unụ Kwezuonụ OKWU MMALITE I meela,
Chineke, I meela I meela,
Chineke, I meela o Imeela,
Chineke, Imeela Onyeaweanyi (otito) (onyinye) CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ Nkịta nyara àkpà Nsị
àgwụ n'ọhịa Ọhịa ogwū mara ọkụkọ A naghị epio yà epiọ Òke bàa na mkpọ Àzụ gwụ na mkpọ Dinta buru egbé Anụ
àgwụ n'ọhịa Isi akwu daa n’àlà Nwaànyị
arịa ya elu Agụ bàa n'ọhịa Mgbada
achịri ume n'aka Mmiri riri nwa awọ À
naghị egwū ya ègwù Ahịajọkụ agbaala afo iri abụo na abụo. Ọ mụtala umu iri na isii, na ederede iri
na isii. Ozugbo ha, n'asụsụ Bekee. Na ndị ochie dike ndị a, na ndị
diji ndị a, na ndị ọkà okwu na otụ ilolo ndị a, ọ
dịbeghị nke ọ
bula n'ime ha nwere ụdi nsogbu mụ onwe m nwere n'asụsụ m ga-eji akpụpụta echemeche m ma ọ
bụ kwupụta mbunoobi m Ihe kpatara nke a bụ na na 'Citation on The Ahịajọkụ Lectures' ekwuru ya n'akpughị
mmiri n'onụ na: Each lecturer is to choose his or her
Language of delivery bearing in mind that the audience understands both Igbo
and English. Ụmụnne m na ụmụnna m, unu anụla ya nụ. Ọ bu ihe a ka Igolo. Gius
Nkemjika Anọka, Ode Nguru, na ndị komiti ya chepụtara ma kwuo n'afo 1o7o mgbe ha
naewube Ahịajọkụ. Ndi niile maara ihe e jiri mara m na ihe mere m jiri bụrụ ihe m bụ, maara na anọ m na nsogbu.
Ezigbo nsogbu o. N'ezie, adi m ka onye chi ya na ogo ya rịorọ olụ, n'ọnọdụ a m hụrụ onwe m n'asụsụ m ga-eji. Chi m n'ebe a bụ asụsụ Igbo; Ọgo m abụrụ asụsụ Bekee. N'ezie, ọ
na-adị m ka na ụfọdụ - ikekwe - otụtụ ndị bịara Ahịajọkụ n'afo a, bịara ihụ etu nwoke ga-esi anabata aka mgba asụsụ cheere ya. Ma a kpọrọ ya
Ahịajọkụ ma ọ bụ Ufiejọku o, ma ọ bụ Njọkụ ma ọ bụ Njọkụji, ma ọ bụ Ajamaaja, - ha niile bụ otu ihe ma bụrụkwa okwu ọkpụ Igbo. Ahịajọkụ bụ mmemme. Ọ bụkwa evueme ndị Igbo. Otụtụ ndị bịara mmemme a, n'ebe a, n'afo a, bụ
ndị Igbo. Nga a
anyi guzọrọ ugbuaaka a bụ ala Owere Nchi Ise, n'ala Igbo. Ebe
ihe ndị a niile dizi etu a, ọ bụ gini gbochiri anyi iji asụsụ Igbo gawa n'ihu? Nga olee ka mba ọ
bụla si akpata nkụ ha ji esi ihe? Kedụ ebe mba ọ bula si enweta mmiri ha na-anụ? Ọ bụ na mba ndị ọzọ?
Olee ebe e si agbata mmiri e ji esi ụgụ? Eche m na ọ bụ mmiri ụgụ gba(pụ) CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ Ladies and Gentlemen, the point I
have tried to make is that no Ahịajọkụ lecturer before me has had my
dilemma in the choice of the language for preparing and delivering his lecture.
All before me who have trodden this road had no problem with their language of
delivery. Not necessarily because of what they had to talk about but
necessariiy because of their training. Luckily, in the extant and pristine
citation crafted by those who thought of and through Ahịajọku, it was explicitly stated that
each lecturer is free to choose his or her 'language of delivery' because the
audience understands both ‘Igbo and English.’
Simple, children like statements are rarely childish. Are choices really
ever free? Aren't they hemmed in by the imperatives of context-time, space,
dramatis personae? Again, who says the typical Ahịajọku audience 'understands' both Igbo
and English? And when we talk of both Igbo and English, are we talking about
conjunction, disjunction or co-ordination? Are we talking of a monolingual
presentation through and through in either Igbo or English or of the bilingual
presentation in both Igbo and English, in one text, or of the same text
presented simultaneously in Igbo, and in English all bound together as a book
in the Aboyedean sense? We know that bilingualism has as many types as it has
varieties. Ladies and Gentlemen, I will stoutly resist the temptation of being
drawn from ikpọta ụtaba to iba n 'ime ahịa. Ndị
nwe m, we all have
our own different proverbs and anecdotes for why it is the mad man uses so many
words. That is really stream-of-consciousness at work. I have mentioned the
Igbo, Ode Nguru, Ambassador Gaius Nkemjika Anọka, master bureaucrat 'and
administrator, International diplomat, Poet, Scholar, Linguist, Thinker,
Traditionalist and a Knight in the Anglican Communion, Master Facilitator and
Strategist in Igbo Lore. Have you ever heard of The Readings on the Igbo Verb, The Dictionary of Igbo Place Names
and the still-born Standard Igbo
Dictionary (Project) scuttled by the ndorondoro between persons, offices
and location? Division of Culture in the Ministry of Information and Culture
and The CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ Gwa m gwa m gwa m, ... Gwanụ m.(ihe) ... Ị mara, Ị marala, Ị marala ... O befọrọ be onye? Nri ọ na-adighị, Onye nà ọ gaghị eri? Ụgwọ onye ọ bụ la aghaghị ikwụ Ihe nyirị dike? Ihe a gụrụ aha, O di ka aha a gụrụ ya? Ozuru ụwa nille? E zuru ezu gaa E zughị ezu laa? Maazị
Chiifu, Dọkịta Frederick Chiedozie Ọgbalụ
has paid his own debt. Whatever anyone likes, let him say about Ọgbalụ. Nobody can take away from him the
fact that between 1944 - 1992, he literally facilitated the empowerment of the
Igbo language for functional literacy, numeracy, creative literature and in the
collection, transcription and description of Igbo orature. F.C. Ọgbalụ, he is also now dead. So, too, another Frederick, Professor Doctor
Nnabuenyi Ogonna, the authority on Mmanwụ, in particular, and Igbo dramatic
arts in general. The diegwu of the
Lagos School of Igbo Studies. Maazi Tony
Uchenna Ubesie proved to the international world of literary creativity that
the Igbo language, can contribute its own to all genres of fiction, faction and
radio-television productions. Mr Chairman, I am not aware that any or all of
this ouartet-facilitators, masters, practitioners and analysts of Igbo
language, literature and culture have ever had any mention at an Ahịajọkụ. With your revered permission Mr.
Chairman, I pray that this highly esteemed and respected audience rise on their
legs, and remove their hats, caps and headgears - in their names and in their
honour, n'ugwu unu niile. May their
great and large Igbo souls rest, nwa jụụụ, in the bossom of Chineke, Olisaburuuwà, Ọpụtaobie! May they become ndịichie n’ala Igbo niile. And saints of the Most High. Ise Ise Ise ọ ise Amaala, mma mma nụ Ekeleenụ Mma mma nụ Ekeleenụ Okwu
m chighaa! Back to
my language of discourse. It will be Igbo and English in complementary
distribution and in line with the principle of complementary dualism which
pervades Igbo thinking, Igbo mode of thought and the grammar of structures in
the Igbo language. Igbo and English. Not Engligbo,
for that would be Igbo oxide, Igbo carbon monoxide! Nor Igbo and English with
code-mixing. Or with code-switching. Those are not allowed or tolerated in
'native like' or symmetrical micro-bilingualism. That will be our language of
discourse. I would really have preferred it through and through in Igbo as I
did in the first in the series of the Odenigbo
Lectures: Olumefula. But do all of us
here; really, understand Modem Spoken Igbo with all its complex internal
dynamics and the evolving protean language for talking about Igbo IN Igbo; otherwise called Igbo
metalanguage? We all are familiar with the ụkabụilu of the sick mart who went to the
traditional doctor for treatment. After he had reeled off his mind, the doctor
asked him to put himself at ease, comfortably. While trying to do so, a huge
fart was heard. And the doctor asked him what the matter was. The patient
replied, well, 'you can hear and see things for yourself. That is one of my
ailments.' You all can now see with me, why it has taken Ahịajọku so long to recognize the other
side of the Igbo identity and reality - the Igbo Language! Is it because we
were waiting for the young to grow, in s milieu where age is something? Or is
it because what concerns us most, must be treated last? MBÈ àgaba Ajambène MBÈ àgaba Ajambène MBÈ gaa gaa Ajambène Inu m, na akụkọ m na okwu m enupụụnọọ faa faa gidigwom wee
nukwasị ofu nnukwute ala, otu obosara ala. Ọ bụghị ala Ịgala, ala Ọnọja Oboni. Agadaaga ala a di, site n'ala ndị
Nsụka n'Ugwu
ruo na nke ndị Ikwere na Ahoada, na Ndida; ma sitewe n'Ehugbo n'Ọwụwa Anyanwụ ruo n'ala Ndịosimili, Ụkụani na Ịka, n’Odida Anyanwụ. Ala Igbo di mbụ dịrị tupu ndị
Potokori eruo Ose Naịjirịa n'afo 1472. Ọ tọrọ E mee elu mee ala, mbo tọrọ
eze. Ma ọ masịrị ndị di ka Bala Usman na ndị ọdịka ya. Ndi a bụ
ndị ka nọ
n'afọ 2001 na-eso onye di ka Hugh Trever Roper na-ako ka ọ
siri masị ha, ka
Naịjirịa siri malite ma ọ
bụ ka Naịjirịa kwesịrị ịdị.
Iji tupịa okwu m ọnụ. E kwesịrị ikwusị ya ike na ala Igbo kwupụrụ iche n'ala mba ndị ọzọ
soro mepụta Naịjirịa ka anyị siri mara ya ugbuluaka a! N'ugwu ala
Igbo, Ndị Nsụka ka ma oke ala ha na ndị Igala, na ndị
Idoma. Etu ahụ ka ọ di ndị Abankeleke (Izii) na ndị Idoma na ndị
Tiv na ndị Mbembe. Wee ruo echi, ndị Ehugbo na ndị Arọchukwu maara oke ala ha na ndị
agbataobi ha ndị a - ndị Mbembe, ndị Yako, na ndị
Ibibi. Ndị Ngwa na ndị Ụkwa maara nke oma oke ala ha na ndị
Mmom. Ndị a niile bicha n'Ọwụwa Anyanwụ. Na Ndịda (Naịjirịa) ndị Ikwere na ndị ụmụnne ha, ma oke ala ha na ndị Ịjo na ndị Ogoni na ndị
Andoni. Ndị Ekpeye na ndị Ahoada masịrị oke ha na ndị
Ịzon na ndị
Ogbịa. N'Odida
Anyanwụ, Ndịosimili na Ndi Ụkwani na ndị Ịka, ka mara oke ha na ndị.
Urhobo na ndị Isoko na ndị Okpe. Ala Igbo, ọ teela ya. Ọ teela ya na ndị
egede nwere ya. Ala Igbo bụ ọkpụtụrụọkpụ ala. N'Ugwuele, n'Ehugbo, na Nsụka na n'Igboukwu e gwụputala ọtụtụ ihe okpu kabon - 14 na-egosi na ọ
peka mpe, ndị
mmadu ebiwela n'ala Igbo site n'afo 100,000 tupu a mụo Jesu wee ruo afo 5,000 tupu a mụo Jesu. Ọ bu ezi okwu na ndị
ọkaa na mmụta ka kaa-asụ ngongo n'ikwekorịta ma ndị
(mmadụ) ahụ bi n'ala Igbo, n'oge ahụ, nke ka nke, n'Ugwuele - ma ha bụ
ndị Igbo ma ọ
bụ ee. Ma otu ihe di n'enweghị
mgbagha bụ ebe Ugwele di taa. Ọ bụ n'ala Igbo. Mana ka m jụkwaa o, mmadụ ole na ndị nọ ugbu a,
na-ege m nti ma ihe ndị a m na-arụtụ aka maka Ugwele n'akụkoala ndị Igbo? Ihe a abụghị akuko mbe na ajambene. Ihe a bụ
ọkpụtọrọọkpụ okwu nwere njirimara ya. N'ezie ọ bụrụ na ọ bụ ndị mba ndị ọzọ
nwere Ugwuele n'akụkoala ha, ha ga-egi ikòrò na ògele na ngwa ndị di
ugbu a, e ji ezisa ozi na redio n televishọn, na opike na ederede dịgasị iche na-ekwu maka ya, na-ako maka
ya, na-ama njakịrị, na na-agba oke ogbondu na egbe onụ maka ya. Ma na-agwa ndị mmadụ, ndị mba ọzọ n'ụwa niile: bịa lerenụ, bịa hụrụnụ, bịanụ kilibenu. A ga-ewu oke ụlọ ọkpụ e ji ọla edo chọọ
mma, ka ọ ga-abụ oge onye - na ndị - chọrọ, na ka onye
ahụ-na ndị
ahụ siri chọọ,
ha bịa, a sị ha: Kilibenu Kilibenụ Kilibenụ o Kilibenụ Ihe kara mere n'ekobe Kilibenụ Kilibenụ Kilibenụ o Kilibenụ Ihe ndị ọkpụ mere n'akụkọ CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ Kà Ị mà nke à Ị mà nke ọzọ ụ Kà Ị sị na Ị ma nke a Ị mà ñke ọzọ Ị nụbela maka Thurstan S na Maịk Angulu Ọnwụejeọgwụ na Frank Anọzie na Lawal. Ọ
kweghị Lawal na ndị ogbo ya na di ọdịka ya ghọta ma ọ bụ chemie na oze di n'ọkpụtorọọkpụ ngwongwo na ngwoloko ndị ahụ e gwupụtara na Nri tọrọ nke oma,
oze nke ahụ e gwupụtara n’Ife na n'ala Idụu - n'usoro e jiri meputa ya. Azi
gbakwaa, otoro gbakwaa ndị kwuru na ndị dere na ndị hụrụ ihe a! Tufiakwa! Kabon-14 aruola
ala! Gini ka nsị na-achọ n'agba? Nwata (ya bụ ndị Igbo) ọ
na-ebu nna ya ụzọ amụta ọkpara? Nwata ọ na-egosi nna ya oke ala! Ma ọ
masịrị
Lawal, ma ọ masịghị ya, ndị maara maka ola dịgasị iche iche, na-ekwu ma na-akowa na
oze nke e'gwupụtara na Nri bụ ezigbote oze e jiri kọpa, tiin na leedi gwọọ. Mana oze nke e gwupụtara n'Ife na Ka Maịk Angulu Ọnwụejeọgwụ na Lawal nọsịrị
na-eme ndọrọndọrọ a, na-agba egbe onụ na egbe ederede a mmadụ ole n’ogbakọ a, mara maka ya,
gụrụ maka ya nụrụ maka ya? Ọ bụghị atụmatụ ọzọ n'Igbo oxide!
Ezechitaoke, Olisabuluụwa na Chi Okike kenyere anyi Ugwuele, na Nri na Nsụka na Ehugbo n'ala Igbo na ọkpụtụrụọkpụ ihe ọkpụ, n'akụko anyi. Ozọkwa, ihe gbasara anyi agbasaghị
anyi. Olee uru Ugwuele baara anyi n'oge ugbu a, n’ụwa taa? Ka ọ bu Ehugbo ma ọ bụ Nri Oreri, Aguleri na Nsuka? Ugbu a,
uwa niile na-ekwu maka w.w.w. ma ọ bụ: sayensi @niile.yahoo.com. Mana ndị Igbo, ha bụ yahoo! Lee ihe J.C. Obienyem dere
maka 'Akwa Ala Igbo Na-Ebe' A zụrụ unù n'isụ ọhịa Ma unù nọrọ na-èlè m anya
ọcha Ụmụ m, oleè ihe m mere unu? Amamihe unù na-anyụ osụ Unù jiri ha ètere ni ọzọ
ofè Mgbè unu hapụrù m n'ida ajo ọhịa Ndị m, oleè ihe mere unu? J.C. Obienyem Akpa Uche
1975:66-7 CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ CHAKPII wọọọ Ihe niile anyị nwere n'ụwa à Ònye nyèrè ànyị ha Chi
nyere anyị o Chi
nyere anyị o Mba niile Igbo nwere n'ụwa à Asụsụ niile e nwere n'ụwa a Olu niile e nwere n'Igbo ASỤSỤ IGBO: OLUMBA NA IGBO
IZUGBE O wee bụlụ ma okwu. Ogbu a, inu m, na okwu m na
akụko m
enukwasala asụsụ Igbo. Asụsụ Igbo na olumba ndị dịgasi na ya adịrịla
adịrị asụrụla asụrụ, n'oge ọkpụ, tupu Bekee na Ụka abịa n'Ala Igbo. Site n'Ugwu wee ruo na
Ndịda n'Ala Igbo, site n'Ọwụwa Anyanwụ wee ruo n'Odida Anyanwụ n'Ala Igbo, mba ọ
bụla nwere olu ha na-asụ e jiri mara ha. Anyi ekwuola ya na
Ala Igbo bụ obosara ala gbanyere ụkwụ na steeti isii, dị ka Naịjirịa sịri dịrị ugbu a. Ndị a bụ: Anịọma (na Mkpụrụụda asụsụ, na mkpọpụta nke ọ bụla Mkpọpụta ụdaasụsụ - ngowire, ndebeolu, ọdịdị olu, olu nka, n'abụ na n'ukwe Mkpụrụasụsụ na mkpụrụkwu Mkpọkpụta mkpụrụsasụsụ na mkpụrụokwu Mkpọnuume, mkpọnaakpo,
mkpọna egbagbere Nkebiokwu, nkebiahịrị, ahịrịokwu
na ndịnaya Nnyemaka ngwaa, mmejupụta ha na mpụtara ha Ndị Igbo niile maara nke a, ofụma ofụma, kpatara ha ji ebee otu akpata onụ na: Mba na-achi n'olu, n'olu Ma ha kwaa ụkwara Ya adaa kwa kwa kwa Ilu a bụ mmanwụ tiri onwe ya. N'ihi na achọghị m ka ego e jiri lụo nne m laa ọkpọrọ, agaghị m
agbali ikowa ya. Mana n'ihi na nne m azụchaala ahịa nke ya soro igwurube laa mmụo, ka m gbalịa zipụta ụmi ilu a. Ihe ọ
na-ekwu bụ na e gemizie nti na rịịị
na tịịị dị n’olumba gasị anyị were anya ahụ e ji ahụ nsị osa, na ntị ahụ e ji anụ ikiri ụkwụ esu, anyị ga-ahụ ma nụ otụtụ ndịiche, site n’otu ebe gaa
n’ebe ọzọ n’olumba ndị Igbo. Mana anyị bịa n’ihe ndị ahụ asụsụ jiri bụrụ otu njirimara ndị, na omenaala
ha, olu na ibe ya bụ otu, site na nghọta na mpụtara dị n’iminiimi ha, na n’ọkpụ
ndịrị ha –
na mpụtara na nghọta ha. Asụsụ Igbo nwere otụtụ olumba. E nwebeghị ike imatacha olumba ole di
n'asụsụ Igbo. Otu ihe anyị maara bụ na ọ karịrị steeti ole a na-asụ Igbo ka asụsụ mbụ, maka ụfọdụ ma ọ bụ niile, na ha. Otu ihe ọzọ
anyị maara bụ na olumba ndị a erughị ka komuniti ndị
nweere onwe ha, na goomenti ndị di ugbu a n'Ala Igbo, na-ekewapụta aghara aghara. Otu ihe ọzọ
anyị maara bụ na e nwere otu olumba, oge, ndị mmadụ na adimkpa nyeela ndị Igbo. Ọ
bụ nke a ka
a na-akpọ Igbo Izugbe. Asụsụ di ka Igbo, a na-asụ n'obosora ala di dika Ala Igbo, asụsụ nwerela abidii ya oke mgbe, asụsụ nwerela otụtụ ederede na ya, asụsụ so asụsụ abụo ndị ọzọ bụrụ asụsụ Ala Naịjirịa, a na-akụzi site n'otaakara wee ruo yunivasiti
dị ka A1 na A2, asụsụ a na-asụ na redio na televishon, were ya
na-eme otụtụ ihe ndị digasị iche iche, asụsụ bụ na ndị na-asụ ya ruru 20m ma ọ
peka mpe. Asusu di etu a
kwesiri inwe Izugbe abuo - nke osusu na nke odide. Izugbe Osụsụ na Izugbe Odide abụghị ebiri. Nke osụsụ tọrọ nke odide. Izugbe
asụsụ Igbo malitere kemgbe ndị Igbo
si na mba digasị iche bidoro nwewe mmekorịta n'ọgbako, n'azụmahịa, n'ụlo ụka, n'ama egwuregwu, n'ụlo akwụkwọ, n'egemnti na mkpịrịta
ụka na
ejije na ihe ndị ọzọ a na-eme na redio na televishon. Izugbe
Odide malitere kemgbe ndị ụka Siemesi tinyere anya n 'asụsụ Igbo imepụta na ikpụpụta otu olu Igbo ga-abụ ozuruigbo niile onụ. Na mbụ na mbụ ndị Siemesi wubere Isuama site
na mgbali. Schon, na Saro.' Mana ka Schon garuru Abo sụo Isuama
n'enwegbhi onye ghọtara ya ka ọ kpụpụta na akamere anaghị adi n'asụsụ. Achịdikịn Denis ewee
gbalịa chopụta Yunion Igbo
ka ọ bụrụ Igbo Izugbe. Nke ahụ kụkwara afo n'ala. Ida Ward ewee haziwe Central Igbo, etu Welmers na Welmers siri hazie Compromise Igbo. Na ndị a niile ọ
dighị nke a
nabatara ka ọ bụrụ Igbo Izugbe. Ma ka agha Bịafra biri, n'afo 1970, Otu Iwelite Asụsụ na Omenaala Igbo bidoziri haziwe Igbo
Izugbe nke e jizi ede ederede Igbo ugbu a. Na mkpọkọta okwu m, ọ
kwesịrị ka
anyị mata na Isuama, Yunion,
Central na Compromise Igbo jikọrọ aka mee ka mpupụta na nhazi Igbo Izugbe na-aga were
were. Ọ bụ naani Igbo Izugbe a nwere ọkaasụsụ Igbo. Ọ bụ nke a bụ otu oke ndịiche di n'etiti
olumba ndị ọzọ e nwere n'asụsụ Igbo na Igbo Izugbe. Sọọ nwata ụ
nọ n'ikpele mmili Kwe m eke Ekene Oma O ma Oma
na udo Údo Ùdo
obele O bele Obele nza Nza Nza
atụle Atụle Atụle òbò O bo Obo
n'ụgbo Ụ gbo Ụgbo n'amì Amì Amị
gololịo Osikapa Joloof O nà-àsonashị
kombiìfu Osụwayịwayị Ìyaà Ladies and Gentlemen, THE IGBO OF INNOCENCE THE ESSENCES IN IGBO
CIVILIZATION In the age of innocence the indịgenous, native and
original Igbo were simple child-like, hardworking, imbibing from their elders who
were steeped in essence, in the lores and mores of Igbo culture and
civilization. As the young Igbo grew up they were exposed to and imbibed four
crucial 'cults' (but without the pejorative senses of today).
Essential in his inculturation
programme, the Igbo amika and ntoroobia, were taught to recognize the Alusi or
supernatural being forces for what they were. Even though they could have the
features of men, the Alusi were neither living human beings (mmadu) nor dead
human beings (mmuo). In the age of innocence, the Igbo, whatever was their
location in Igboland, shared an identical conception of the Cosmos. To them the
universe was divided into four complementary departments: Ùwà, Mmuo, Alusi and Okike. Uwa (-wa break open; split open, be cracked) in the world of
the senses is seen in Igwe (the
heavens or firmament) and Ala (the earth) Uwa is inhabited by Mmadu (living human beings), Mmuo
(dead ancestors who, as ndịichie, the canonized ones, can re-incarnate,
or as Akalaogoli can't re-incarnate, or Ekwensu, mischievious spirits, and
Agwu, the maverick ambivalent trickster spirit which through divination, Afa,
reveals to human beings the complex nature of the cosmic relationships in the
Igbo world. Very close to but distant from Uwa ndị Igbo, is Chi Ukwu
(Chukwu), the Great Chi (God), Chi Okike = Chinaeke (the Creator), Olisabuuwa
(the God that carries the world). In the pristine world of their bucolic
innocence, the Igbo revered Chukwu (God), the Great Enigma, Amaamaamasịghịamasị (The-known-and-not-so-known). Ọnọnsomateeaka
(One-that-is-near-but-still-far). The innocent Igbo venerated Chiokike because: Ikeechukwuebuka Chukwunọnso Chukwuebuka Chukwuenweghịiwe Chukwunweikeniile Chukwunwendu Chukwukadibịa Chukwujindu Chukwumụanya Chukwumaobimmadụniine Chukwubụike In the philosophy of Igbo knowledge Chukwu kere In the age of innocence the rural
Igbo had very great respect for Ndu (life) because it comes from God. It is
greater than money or wealth. It cannot be foundered by blacksmith. All things
are only useful if they have life. Osondụagwgụike Ndụbụeze Chukwụbụndo Ndụbụisi Chukwunwendụ Ndụkaego Chukwujindụ Ndụkaakụ Ekejindụ Ụzụakpụndụ Ifebụnandụ Mdịkaanwụifemgaemedị Ifesinandụ Obụlụnamdịndụifemgaemedị Ifeakandụ In the age of pre-innocence, God allowed
Death to be in order to checkmate Man. There are many versions of the aetiology
of death in Igbo cosmology. The race to deliver the message of life and death
from God to man by the Dog and the Tortoise exists in Igbo folklore. God had to
bring death to the world so that: Onye lote ọnwụ O mea nwayọọ N'ihi na Ọnwụatụegwu Ọnwụenweiro Ọnwụatụaka Ọnwụamaoke Ọnwụasoanya Ọnwụakpaoke Ọnamaoke Ọnwụnọnso Ọnwụeliego Ọnwweteaka Ọnwụelingo Ọnwụejeọgwụ Ọnwụenweoyị Ọnwụamaife In the age of innocence the Igbo
respected age and the elders almost to the point of reverence because: Nwatà kwụlụ ọtọ ọ
má-afụ yá A hụ, e kwughị nà-ègbu okènyè E kwuo, a nụghị nà-ègbu nwatà In their ranking of professions or
attributes, the igbo of innocence ranked brain over brawn: Kalịa aya gà-èli ọtụ ilòlò Ya lia dike Thus the strategic thinker, the
philosopher, a bundle of brains is preferred to the warrior, the military
strategist, the man of strength. For, whereas the latter is replaceable and
dispensable, the former is not replaceable, and is indịspensable. Tied to
the virture of thinking and geometric reasoning is the indgenous Igbo ranking
of amamihe (absolute wisdom) amamizu (absolute wisdom) over: Àkọ 'smartness, ‘wit’ as in Nwa Ebule Ako Uchè ‘commonsense’ (without real
wisdom) Àkọ nà uchè ‘wisdom’ Ñtụbịrịkọ ‘diplomacy’ If the above analysis is correct,
what then do these mean? Àkọ bụ ndụ Uchè bụ ndụ Uchè bụ afa Uchè bụ àkpà The autochthonous Igbo of innocence
prized material possessions but would not make a fetish of them because
material possessions come from God. Chukwunweụba Chukwujiụba Ekèjiụba Ụbàsìnàchi But if: Ndụbụàkụ Nwabụàkụ Mmadụbụàkụ Madụwụụba And then: Nwakàụba Mmadụkaụba In the light of the above what is? Àkụ ụba àkụ nà ụbà Possessions possessions of assets wealth ·
Eluluù
(animal resources) ·
Akụmakụ (forest resources) ·
·
Ndịinyom
(wives) ·
Ụmụ (children) ·
Ohù
(slaves) In terms of wealth, the Igbo of innocence were concerned more
with the creation and acquisition of wealth - than with the spinning of money.
The image of the King in Every man which the Ikenga and the Ụkwu na Ije cults seem to portray, is
only partially correct. Adventure and success are not only carried out and
achieved in society, they are measured against other people in and the virtues
society. Persuasive eloquence, rhetoric and oratory associated with the
Uhu-cult are society-determined. So, too, is commandịng personality and
influence of the Iru-cult, society-driven. The Igbo of innocence was a
community dweller and a team worker. For while he knew that: 1.
Onye
ya na chi ya kwụ O dighị ihe ga-eme ya Or 2.
Onye
kwe, chi ya ekwe He also knew and believed that: 1.
Mmadụ bụ chi ibe ya 2.
Ịhà mè ịha me ịhà 3.
Ọgọ
bụ chi
ogbenye 4.
Ofu
onye adị-abụ ebò 5.
Ofu
aka adị-eke ngwugwu 6.
Ofu
onye adị-ebu ozu enyì 7.
Ofu
onye adịghị mma n'ije 8.
Otu
mkpịsị aka rụta mmanụ Ya eruo ndị ọzọ 9.
Ihe
kwụrụ Ihe akwụdebe ya 10.
Onye
maani ya kwụ Odudu atagbuo ya 11.
Ọkọ
kọba mmadụ O gaa kwụde mmadụ ibe ya Ka ọ kọọ ya; kọba anụ ọhịa O gaa n'ahụ osisi 12.
Otu
onye lie onwe ya AKA ya ga-apụtarịrị 13.
Nwata
nwe ọkpà Mana n'ezi okenye Ka ọ na-akwa 14.
Onye
fee ezè, Ezè eruo ya 15.
Ọhà
nwè tutuu Tutuu nwè ọhà 16.
Aka
nri kwọọ aka ekpe AKA ekpe akwọọ aka nri All the above proverbs emphaize the
complementry roles of indịviduals with indịviduals - inhuman
society. So, too, does the aetiological anecdote about why 'Fowls go in twos -
because the thing that kills fowls (hawks) come from above. If one fowl sees
the enemy first, it alerts the others. So too do personal names like: Adimabua Nwaìgbò Adaọha Igboanụgo Nwaọha Igbonaekwu Obiọha Igboakalụzịa emphasize complementation, reciprocity and group plidarity. What I have been saying so far
suggests complementation rather than polarity, inclusivism rather than
exclusivism, and holism rather than indvidualism. Too much: exists in the
political, sociological and cultural literature about the Igbo being an extreme
indịvidualist, a lone ranger (= I-go-before-others). I would not,
however, like my audience to go away with the impression that the Igbo society
of innocence and the Igbo people of innocence did not have their fair share of
mavericks, madmen and deviants. They had. But they believed these were the
exceptions that give vibrancy and relevance to the rules.
Some people among the Igoo of
innocence did do what they were not expected to do. The ten, universal
commandments were broken. There was incest. There was adultery, fornication and
abortion. For the Igbo language has words for these. People ate animals, fishes
and fruits they were forbidden to eat. People went to other people's farms and
removed yams and cocoyams from their farms and barns. But there were sanctions
for those caught in the act. There were public confessions, executions, and
suicides for those who offended grieviously against ala. For:
A rịàghị àrịà ànwụ For those who confessed their transgressions, there was
forgiveness. For: Mmehie dịka-àdị Mgbayàlị adị-àdị The Igbo of innocence lived in and
operate within his umunna, at the
three levels of partilinage: minimal, major and maximal. He also lived and
operated within the Ikwunne or Nnamochie - the matrilinage. At the
widest level, he operated within a village. Beyound that, he went into an mba - another or foreign land adjacent
to his and with which it had all sorts of alliances and relationships. Even in
some of the known (Igbo) kingdoms the king, even where there was a
primogeniture, was treated as a President-for- as long as he proved himself
people-centred, democratic and republican - and his people were satisfied with
his reign not rule. For: Ọhà nwè ezè Èzè nwe Ọhà In conclusion, the Igbo of innocence
loved and coveted wisdom and applied it to all he thought, said and did. For
him Chukwu himself created wisdom and so all true wisdom came from Chukwu. This
true wisdom is not just one of intellect, derivable from facts but a passion
for truth. The young garnered it from counsel, instruction and observation from
the elders and the wise, through informal traditional education whose unwritten
texts were the folktales and other narratives the proverbs, anecdotes, tongue
twisters, riddles, songs and poems of all descriptions and genres, feasts and
festivals. Whether as technical knowledge, or hypostratic knowledge, true knowledge
as against spurious wisdom is what kept the Igbo going in their arcadian
innocence. THE BACKGROUND TO
EXPERIENCE Mutual trans umunna, trans ogo, trans mbam, trans mba contacts,
with other sub-cultural Igbo groups within Ala Igbo. This was one factor.
Mutual trans Igbo culture contacts with their non-Igbo neighbours ( THE IGBO OF EXPERIENCE According to Onwuejeogwu (1987)
exprience intergrated the theatre of Igbo civilization into what is today
called
nweghị omà: Aju e ji èbu ezè dọ nà ngwùrù
niile Di n'ime Olu nà Igbo Ebe m nwèrè òkpu mmèe mmèe Jide ija nà ñkù akpukpọ Ezè, ọ fọrọ ihe ọzọ
Àjàdu nà-akpọ isi àlà, ọ
na-akpọrọ
onwe ya Ebe ọ bu ego bu igidigi oju eze
Ego tụa ahụ, eze adawaa! Ma eze naịrà, ọ bụ eze gini? Eze ụra atụ na eze nkwōro E gbue ebi naabo, e zoo otu Okwu sie ike, ndị uwe ojii na
ndị dibia Bikonụ, eze naịrà, ọ
bụ
eze gini? Nolue Emenanjo (ed.) Ụtara Nti pp. 63-4. Put in the most simplistic language
the combination of all the agencies and forces of the post-innocence era
resulted in the emergence of men without shape, women without ears, shapes
without forms, hollow men without backs; for whom all things are not where they
are supposed to be, the spirtus mundị was ambivalence,
the zeitgeist;
snakes swallowing snakes. Ebe niile abụrụ mmadụ mmadụ, mana mmadụ akoo. Ụkwụ eju ala, mana ije adighị. N'ezie, ọkụkọ
agbasaala okpesi. Ndị nọ n'ala bidoziri dagbuwe ndị nọ
n'elu. Akwụ wee chaa n’ọdụ igù. Ịkwighịikwighị efebezie
n'ehihie. Eỳi n'ehihie. Ndị eze akarịa ndị ha na-achi. Ya abụrụ mpụ n'elu, mpụ n'ala. Enyi mbekwu na Uze ejuzịa n'ebe niile Nke bụzi na n'Abụja na n'Ajegunle, e nwezi eze ndị
Igbo? Nke a, abụghị eze akhje! Ka ndị eze siri hie nne ka aha
(otutu) ha siri na-eyi egwu ma dikwa egwu! Mmirinaezònaọkọchi I Otuonyeanaetuụnuabịala I Oshìmìrìrieonyeorieọgwụya I Odịụkonamba I Gwugwuga I Odụmnaegbuagụ I Anụanaagbaegbeọnaatahwịọhwịọ I Mmirinaarịugwu I Ndị bụ na karịa ha ga-echepụta ma rụpụta ngwa ọhụrụ, ha alaa defence, rụo ngwa ahụ akpụrụka ma mepụta ajasa ya, adịgboroja ya, ijebu
ya! Nke a emezie ka n'Ala Igbo niile mana ọ karịrị n'Aba na Ụlụ diwazịa ka Lo Wu, oke obodo ahịa di na Shenzhen na I will now end my observations and
impressions about the Igbo experience with this poem, (a little adapted) from
an anonymous hand. It's title: (THE) NOTHING PEOPLE They do not lie. They just neglect to tell the truth. They do not take, They simply cannot bring themselves to give. They do not steal, They scavenge. They will not rock the boat, But did you ever see them pull an oar? They will not pull you .down, They'll simply let you pull them up, And let you pull them down. They will not hurt you, They merely will not help you. They do not hate you, They merely cannot love you. They will not burn you, They'll only fiddle while you burn. They are the nothing people, The sins-of-omission folk, The neither-good-nor-bad, And, therefore, worse. The good, at least, keep busy, trying, And the bad try jut as hard. Both have that character, That comes from caring, action and conviction. The honest sinner with God and Satan. They know the price of everything, But do not know the value of anything They scream about national character. But, given the chance, They live and practise family character. Or sell out their own quota and the character Or scatter everything, like the fowl Who says: Scatter and scatter lest another eat! CHIAKPII wọọọ CHIAKPII wọọọ CHIAKPII wọọọ Enye m i ọkwụlụ inyom
inyom inyo! ọkwụlụ Inyom Enye m i ọkwụlụ inyom
inyom inyo! ọkwụlụ Inyom Enye m i ọkwụlụ inyom
inyom inyo! ọkwụlụ Inyom Okwụlụ àkpàjili inyom
inyom inyo! ọkwụlụ Inyom Asụsụ neafụ o inyom
inyom inyo! ọkwụlụ Inyom THE IGBO LANGUAGE OF
EXPERIENCE ...n'okwu Igbo Ndị gboo kpara ụka n'asụsụ a Ha kọrọ akịkọ
ọchị,
daa kwàkwàkwà; Iwe hà pụtàrà n'okwu zuru òke; Ha gbàrà ìzù, ghọta ònwe hà n'Ìgbò Ha bụrụ Mbe n'echìche okwu Ìgbò Ha bụrụ Ndùrì bụkwa nwa Ọkịrị Ha zara ọkwà nka, zaakwa ọchị agha A kpọrọ ha mà ọkà
okwù mà ọkà alò N'ọnụ na nghọta, ha nọrọ
bụrụ
Ìgbò J. C. Obienyem, 'Mbo m Na-Agba' Akpa
Uche p. 69. The Igbo language of innocence was,
as should be expected, a closed circuit phenomenon. Each person spoke his
dialect (D1) in his umunna, his ogo, his onumara, his mbam -
essentially and unrepentantly, undịluted. The smiths who produced the
Igbo-Ukwu bronzes must have spoken an undịluted Aguukwu-oeri D1.
So too the axe makers at the foundries at Ugwuele, an Okigwe D1. And
the salt makers of Uburu, and undịluted Ehugbo D1. What did
the Nri aka nshi speak when they went on their religious njem across
those parts of Igboland within the Nri hegemony? At the axe foundries of
Ugwuele what language did the master axe makers, their patrons and their
clients speak? When the Aro went on their exploits beyond Ibiniukpabi, and, for
Ibiniukpabi, how did they communicate along their routes? What language was
used by the Ekumeeku Warriors who were drawn from all parts of Aniomaland? At
the salt markets in Uburu and the horse markets at Nsukka, how did the buyers
and sellers communicate? My haunch (given today's experience) is that
Igbo-speaking people who left for other Igbo-speaking mba modified their D1
- or learnt and used the more prestigious D1, for purposes of
intra-group communication. Let it be emphazised that inspite of the political
independence of the mba, there were many forms of formal and informal contacts
and for inter-dependence between various Igbo-speakingpeople before the dawn of
experience: trade, marriages, fairs, festivals, feasts, and even wars. These
were veritable avenues for mutual exposure to different lects, varieties,
jargons, sound systems, syntactic structures, lexical elements and semantic
systems in the Igbolanguage. With experience came greater mobility
within ahd beyond Igboland, as the Igbo and their land now had greater contacts
with other peoples, other cultures and other languages. The nascent Spoken
Standard Igbo began to grow and grow in its lexical inventory, especially, in
the names of plants, animals, geographical features and phenomena alien to Igbo
culture. Words like osikapa, otanjele,
jakị, dawa, akamu, alakwuba,
agidi akpoto, elele, munchi from Ugwu Awusa, ụrooshi,
ichafo, abada, panya,
from European Languages via the Coast; oloma,
agboro, wayo, ashawo, jedijedi from yorubaland; Iduu, iyase, Agwuele, from Edoland; banga, bonga, ogogoro, agogo from the Niger Delta, mmom, abasị
afaniko, Ibibi from
Ibibio-Efikland. Just as new words were coming in and being domesticated to the
realities and imperatives of the Igbo sound and lexical systems, so too, new
tales, proverbs, and anecdotes were being welcomed and added to the repertoire
of Igbo folkore, poems and songs. Collectors of unwritten Ibo literature are
used to choruses, non-ideophonic words, phrases and sentences which they often
treat as either 'archaisms', 'nonsense words or 'obscurities'. These so-called
archaisms and nonsense words may well be from languages which are either
siblings of the igbo language or 'live' languages spoken by non-Igbo neighbours
of the igbo or others who have come in contact with the Igbo. As for the
'obscurities', those references which may now look opaque may well be
references to phenomena in cultures and literatures which are neighbours to th igbo.
Among the Anioma, for example, references to Ala Iduu are copuous. And
characters like Giant Alakwukwu, an Agwuala (i.e. Giant), Gbanwula Asigie,
Ogiso and Ezechime, feature robustly in their folklore and oral histories.
These and many more features of the language contacts between Igbo and the
languages of their neighbours are begging for urgent studies. IGU AKWUKWO NA IGU EGO Onye ọ bụla chọrọ iga n'ihu, ndị ọ bụla chọrọ iga n'ihu, ezi
na ụlọ ọ
bụla, ụmụnna ọ bụla, ebe ọ bụla, ogo ọ bụla, uhe ọ bụla, mba ọ bụla, obdo ọ bụla, n'ezie, agbụrụ ọ
bụla chọrọ iga n'ihu ga-ebu
ụzọ
gwọọ ọgwụ mmadụ tupu ya agwọọ ọgwụ ego. Maka na mmadụ bụ mma di na ndụ na n'elu ụwa a. Leekwa aha ndị a ndị
Igbo na-aza: Mmadụbụakụ Mmadụbụuko Mmadụwụụba Mmadụnaecheibeya Mmadụkaego Madụmereụwajiasoụso Mmadụbụchiibeya Ihekanammadụ Mmadụbụike Mmadụkaife Ị gwọ ọgwụ mmadụ apụtaghị iga na dibịa. Ọ bụ iga akwụkwọ gaa nweta mmụta na mmụba si n'akwụkwọ. Ọ bụ ima akwụkwọ wetara ka mmadụ ghara iko mmadụ ibe ya ma ọ bụ mba ya. Ọ bụ
ụko mmadụ kpatara mmadụ ga-eji eju, a ka na-achọ mmadụ. Iga akwụkwọ bụ isi dọkpụ nti n'etiti ndị na na mmepe
obodo na agbụrụ. Ọ bụ ezie na: Akwụkwọ nà-àtọ ụtọ Ọ nà-àra ahụ na mmụta Mà onye nwere ntasi obì O ga-amuta akwukwo Ịga ezi akwụkwọ na-eweta mmụta na mmata.
Ndị a na-eweta amanihe na amamizu. Ịga akwụkwọ na-enye mmadụ orụ aka na aka
orụ. Ịga akwụkwọ na-achụ ma na-egbochi
Ịga akwụkwọ na-akụzi nka ndị dị ịche
iche
Ịga akwụkwọ na-enye mmadụ ike na
ikike karịrị akarị n'ih ndị a: (a)
mmata
na mmụta maka
(b)
nka
dịgasị iche iche maka:
(gb) Mmaraonwe y.b. mmadụ imara onwe ya site n’ijụ ma ichọpụtasị oziza ajụjụ ndị a:
(c)
ngwa
ndị na-ezipụta na mmadụ adịrịla ezigbo niikere maka ibi nke oma n’ụwa nke ubu a:
(d)
mmadụ ihụ onwe ya n’ụzo zịri ezi na n’emume kwụrụ oto. Nke a ga-enyere mmadụ aka ikwusị ike na:
Ịga akwụkwọ bụ oke ihe. Ọ na akụziri mmadụ nka ndị a bụ
ọkachasị ibe ha: (i)
nka
ntoala,
(ii) nka maka obibi ndu gbasara nzụlite onwe
(iii) nka enwemakaolụ maka
(iv) nka maka amụmihe ebighị ebi, agwụ agwụ N'ezie, igụ akwụkwọ abụghị nnanị maka inweta
asambodo e ji achọ ọlụ oyibo ma ọ bụ e ji agụwanye akwụkwọ. Ọ bụ maka izụ mmadụ, ahụ mmadụ dum, obodo niile na agbụrụ niile ka mmepe na ọganiihu wee
jupụta
n'echiche na n'echemeche ndị mmadụ na mba ha. O bụ maka ịzụ anu ahụ mmadụ na nke ime mmụo ya. Ọ bụ maka ịzụ anya onye ka ọ
na-aru ma ọ
bụ rụkarịa olụ dịịrị ya. Ka mmadụ wee nwee ike leruo ihe anya iji hụ nsi osa na iji mara anya nke e lere
ele na nke a rọrọ arọ. Ọ bụ maka ịzụ echiche ndị mmadu ka ha wee
mata na tutuu nwe ọhà, mana ọhà nwekwa tutuu; na ofe na-atọ
ka ọkwụrụ ma n'agbaghị mkpụrụ ka ọkwụrụ abụghị ofe ọkwụrụ. Ịga akwukwọ na-azụ imi mmadụ ka ọ nwee ike
iminyere imi na mmiri ịchọpụta ebe ndị mmụo si abata n'elu ụwa. Ịgụ akwụkwọ na-azụ ire mmad ka ọ dị ire, nti mmadụ ka ọ wee nwe ike
mata myiri na ndịiche dị n'etiti egbe na egbe. Ọ bụrụ na iga akwụkwọ bụchasịrị ihe ndị a
niile anyị kwuputarala, ọ bụ gini bụ mbunuuche ndị a na asị na: Unù na-àgu akwụkwọ, Anyi àna-àgu egō, Fa ncha bụ Onye na-asị na igụ akwụkwọ na igụ ego bu otu ihe na-agwa ụwa niile na ọ maghị asụsụ Igbo ma ncha. Isi ngwaa a bụ – gụ dị n’ịgụ
akwụkwọ na igụ
onụ (ego) abụghị otu n'ụtoasụsụ Igbo, na na nghọta ha. Akwụkwọ enweghị onụ ma ọ nọmba: A naghị agụ ya ka e si agu ego nwere onụ na nọmba. Ka ị sị na ị ma nke a, I mazigo nke ọzọ
ahụ? Ya bụ, onye sị na ịgụ akwụkwọ na ịgụ ego bụ otu, ihe ọ na-agwa uwa niile bụ na ọ bụ iti, iti bolibo, okpe, mumu, ewu
Nupe! Ọ na-agwa uwa niile na ọ maghị na amaghị akwụkwọ, amaghị agụ na amaghị Ebe ndị ọzọ na-ekwu maka yunion – European
Union, Africa Union – ọ ka na-ekwe maka Ọtọnọmọs
komuniti. N’ebe ndị ọzọ n’ụwa ugbu a nnukwute kompịnị
ole na ole na-ejikozị aka abụrụ otu agadaga kompịnị, ọ
ka na-ekwu maka kompịnị
nke ya na ụmụ ya nwoke naanị. Ịhe ụwa ugbuluaka a, abụkwaghị nwa Arọ iche, mkpọọla
iche, nwa ọhụhụ/isoma ichie; amaala iche, nwaofo iche. Ọ bụ aka weta, aka weta, onụ eju. Ọ bụ a gbakọọ nwa mmiri ọnụ, ọ gbaa ụfụfụ. Ọ bụ ihe kwụrụ, otụtụ ihe ndị ọzọ akwụnyere ya. Ọ bụ ony aghala nwanne ya. Ịgwebụike. Onye naanị ya kwụzi ugbu a, odudu emee ya otụtụ ihe! Onye na-agaghị akwụkwọ agaghị aghọta izụ a, ugbu a. Onye na-amaghị akwụkwọ ọ nwere ike nwee otu agadaga ụlo, ma ọ dịghị ụzo e sị aga ya. N’ime onụ olụ ọ
bụla dị n’ụlo ya, e nwere televịshọn (na Akwụkwọ Nsọ) Mana ọ
dịghị nkọwaọkwu ọ bụla n’ụlo ahụ niile. N’oge ugbu a, olee eve onye,
na ndị dị etu a, ji azụ aga? Ọkpaakụerieri. Mmirịnaezonaọkọchị. Ibe ya jiri ugbo elu
na-aga njem, ọ were moto abalị ebe ọ ga-anọ n’obere oche! Ọ
were bụrụ ụka bụrụ ilulu. IGBO OR IGBOID Mba na-achị n’olu n'olu Ma na-asụ n’olu n’olu Mana ha kwaa ụkwara O daa kwa kwa kwa O daa n'olu olu Time was when it was fashionable to be Igbo. It was then a mark
of achievement to know and speak Igbo, with pride and gusto especially among
the neighbours of the Igbo. Northcote Thomas recorded in 1914 that during those
times it was nothing strange beyond the Nsukka frontier to find ‘a knowledge of
Igbo extendịng fully one day’s match into Igara country but no correspondịng
knowledge of Igara on the Ibo side of the frontier.’ The Ovie of Abraka paid
tribute and received recognition from the Obi of Abo. Igbo ritualists, smiths
and traders from the Igbo heartland were not strangers in Isokoland, Ogoniland
and Ijoland. Just as Igala, Nupe and Idoma traders were common sights in
Ohambele in Ndokiland. On the southern flank at least in the Niger Delta, at
that time, and up to fairly recently, it was fashionable and a mark of
achievement to be born of an Igbo mother. For the belief was that: Onye nne ya na-abughị onye Igbo O naghị aba n'ihe CHIAKPII CHIAKPII wọọọ CHIAKPII CHIAKPII wọọọ Once upon a time Timer Once upon a time and it was a very
long time ago, the Igbo, the Yoruba the Edo among many others of their present
day neighbours, spoke one very big language. Then some 6000 years ago, so say
some historians of language, the Igbo, the Yoruba and the And all these came to pass. Then came
the Europeans as traders, missionaries and colonial administrators. And
Igboland was conouered by force. And sacred Igbo institutions, icons and their
language got into a terrible bind. And the English Language was subtlely
introduced and imposed through the Education Codes and Ordinances,
grants-in-aid to Schools, and the missionary activities of the Catholics,
especially during the Sanahan and post-Sanahan eras. The massive bombardment of
all these on the Igbo psyche led some of them to the point of believing that
'the native' was a bushman who continued to use his language. The new elite -
the Igbo kotuma otue ntu, the interpretes, the cashiers and the non-Igbo
colonial administl.ators carried out all their transactions in English, not
Igbo. Then came the 'great' Igbo Orthography Question - that big ferocious
storm in a tea Cl.lP perpetrated, fuelled and confounded by the CMS and the RCM
over the writing of just a few letters of the Igbo Alphabet. So, from 1929 -
1961, no serious creative literahlre was produced in the Igbo Language. Afigbo
(1981), and Emenanjo (1974: 1993) among others, have said most of all there is
to say about how the Igbo were used by the Igbo to underdevelop their language. Then came the Nigeria-Biafra War. And
the Igbo were again conouered by force. And this came with a new type of
linguistic dilemma - the displacement of glossotomy
or languag unity, with glossogamy or language splitting. On the eve of the Biafran adventure, the Igbo
had a high profile in One of our weak points as a people is that we do not know how to manage crises, adversity failure or misfortune. As an either... or people not a both...and people we cannot understand, let alone reconcile why, in Chinese, the symbol for crises and adversity is the same for challenge, prosperity, success, growth and development. As something likeu, a NothIng People when we charter a society association |